19Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
20ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
21Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ.
22Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
23Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’