Ọrụ Ndị Ozi 3

Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.

Acts 3:8 (UKJV) And he leaping up stood, and walked, and entered with them into the temple, walking, and leaping, and praising God.

6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”

7O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.

8Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.

9Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,

10ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.