10ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
11Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
12Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
13Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
14Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.