8Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
9Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
10ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
11Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
12Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”