Ọrụ Ndị Ozi 4

Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.

Acts 4:22 (UKJV) For the man was above forty years old, on whom this miracle of healing was showed.

20Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”

21Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.

22Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.

23Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.

24Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.