18Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
19Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
20Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
21Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
22Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.