Ọrụ Ndị Ozi 4

Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.

Acts 4:31 (UKJV) And when they had prayed, the place was shaken where they were assembled together; and they were all filled with the Holy Spirit, and they spoke the word of God with boldness.

29Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.

30Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”

31Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.

32Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.

33Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.