27Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
28ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
29Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
30Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
31Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.