25Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
26Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
27Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
28ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
29Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.