34O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
35nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
36Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
37O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.