Ọrụ Ndị Ozi 5

Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?

Acts 5:3 (UKJV) But Peter said, Ananias, why has Satan filled yours heart to lie to the Holy Spirit, and to keep back part of the price of the land?

1Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha.

2Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi.

3Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?

4Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”

5Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.