Ọrụ Ndị Ozi 5

Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere.

Acts 5:5 (UKJV) And Ananias hearing these words fell down, and gave up the spirit: and great fear came on all them that heard these things.

3Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?

4Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”

5Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere.

6Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.

7Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.