29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ.
30Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi.
31Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie.
32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”
33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.