32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”
33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
34Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta.
35Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel, leziekwanụ anya nke ọma ihe unu na-achọ ime ndị a.
36Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa.