Ọrụ Ndị Ozi 5

Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”

Acts 5:39 (UKJV) But if it be of God, all of you cannot overthrow it; lest lest by any means all of you be found even to fight against God.

37Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị.

38Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya.

39Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”

40Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.

41Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.