Ọrụ Ndị Ozi 5

Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.

Acts 5:41 (UKJV) And they departed from the presence of the council, rejoicing that they were counted worthy to suffer shame for his name.

39Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”

40Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.

41Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.

42Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.