Ọrụ Ndị Ozi 5

Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Acts 5:42 (UKJV) And daily in the temple, and in every house, they ceased not to teach and preach Jesus Christ.

40Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.

41Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.

42Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.