13Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
14Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
15Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.