12Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe.
13Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
14Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
15Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.