Ọrụ Ndị Ozi 6

Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.

Acts 6:7 (UKJV) And the word of God increased; and the number of the disciples multiplied in Jerusalem greatly; and a great company of the priests were obedient to the faith.

5Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.

6Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.

7Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.

8Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.

9Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.