3Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.
4Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”
5Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.
6Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.
7Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.