Ọrụ Ndị Ozi 6

Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.

Acts 6:3 (UKJV) Wherefore, brethren, look all of you out among you seven men of honest report, full of the Holy Spirit and wisdom, whom we may appoint over this business.

1Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.

2Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.

3Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.

4Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”

5Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.