Ọrụ Ndị Ozi 7

Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.

Acts 7:15 (UKJV) So Jacob went down into Egypt, and died, he, and our fathers,

13Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.

14Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.

15Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.

16E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.

17“Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.