Ọrụ Ndị Ozi 7

Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.

Acts 7:13 (UKJV) And at the second time Joseph was made known to his brethren; and Joseph's kindred was made known unto Pharaoh.

11“Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.

12Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt.

13Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.

14Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.

15Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.