18ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.
19O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.
20“Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya.
21Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya.
22A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.