21Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya.
22A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
23“Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel.
24Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ.
25Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị.