26Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
27“Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị?
28Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’
29Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.