30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.
31Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị,
32‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
33“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
34Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’