43Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
44“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
45Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
46Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.