45Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
46Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.