47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.
50Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
51“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere.