1Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria.
2Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.
3Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ.