Ọrụ Ndị Ozi 8

Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.

Acts 8:11 (UKJV) And to him they had regard, because that of long time he had bewitched them with sorceries.

9Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.

10Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.”

11Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.

12Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha.

13Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.