11Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.
12Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha.
13Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.
14Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn.
15Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.