Ọrụ Ndị Ozi 8

Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.

Acts 8:15 (UKJV) Who, when they were come down, prayed for them, that they might receive the Holy Spirit:

13Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.

14Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn.

15Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.

16Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.

17Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.