Ọrụ Ndị Ozi 8

Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.

Acts 8:16 (UKJV) (For as yet he was fallen upon none of them: only they were baptized in the name of the Lord Jesus.)

14Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn.

15Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.

16Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.

17Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.

18Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.