Ọrụ Ndị Ozi 8

Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”

Acts 8:24 (UKJV) Then answered Simon, and said, Pray all of you to the LORD for me, that none of these things which all of you have spoken come upon me.

22Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị.

23Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.”

24Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”

25Mgbe ha gbachara akaebe, ma kwusaakwa okwu nke Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala ha zisara oziọma nʼọtụtụ obodo ndị Sameria.

26Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.