Ọrụ Ndị Ozi 8

Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.”

Acts 8:29 (UKJV) Then the Spirit said unto Philip, Go near, and join yourself to this chariot.

27O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke.

28Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma.

29Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.”

30Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?”

31Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.