28Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma.
29Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.”
30Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?”
31Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya.
32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.