32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.
33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”
34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
35Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.
36Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”