Ọrụ Ndị Ozi 8

Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.

Acts 8:35 (UKJV) Then Philip opened his mouth, and began at the same scripture, and preached unto him Jesus.

33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”

34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”

35Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.

36Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”

37Filip sịrị, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim.” Onozi ahụ sịrị, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.