2Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.
3Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ.
4Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara.
5Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.
6Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.