4Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara.
5Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.
6Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.
7Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.
8Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.