Ọrụ Ndị Ozi 8

Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.

Acts 8:7 (UKJV) For unclean spirits, crying with loud voice, came out of many that were possessed with them: and many taken with palsies, and that were lame, were healed.

5Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.

6Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.

7Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.

8Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.

9Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.