Ọrụ Ndị Ozi 9

Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja,

Acts 9:1 (UKJV) And Saul, yet breathing out threatenings and slaughter against the disciples of the Lord, went unto the high priest,

1Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja,

2rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.

3Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.