38O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim.
39Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ.
40Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nʼAzọtus. O jegharịkwara nʼobodo niile dị nʼala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizaria.