20Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.
21O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”
22Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
23Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya.
24Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.