22Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
23Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya.
24Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.
25Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo.
26Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha.