27Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu.
28O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu.
29Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
31Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.