29Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
31Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
32Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida.
33Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.